JW subtitle extractor

Na-echeta Ọnwụ Jizọs

Video Other languages Share text Share link Show times

Weregodị ya na ị nọ n’ụwa
nke udo dị na ya,
nke ahụhụ na-adịghị,
onye ọ bụla nwere
ihe ọ ga-eri,
o nweghịkwa onye
na-arịa ọrịa.
Ma, gịnị ga-eme ka
ihe ọma ndị a mezuo?
Ọ bụ n’ihi ihe
Jizọs meere anyị.
O nwere ihe mere
o ji bịa n’ụwa.
O ji ndụ ya chụọ àjà
n’ihi ndị ọ hụrụ n’anya.
N’abalị bọtara
ụbọchị Jizọs nwụrụ,
ọ gwara anyị ka anyị
na-echeta àjà ọ na-aga ịchụ.
Ọ sịrị:
N’ụbọchị dabara
n’ụbọchị ọ nwụrụ,
ndị mmadụ ga-ezukọta
n’ụwa niile icheta ya.
Ndịàmà Jehova na-akpọ
gị na ndị ezinụlọ unu
ka unu bịa
Ncheta Ọnwụ Jizọs.
Ị bịa nnọkọ a,
ị ga-amata ihe mere
àjà Jizọs chụrụ
ji baa ezigbo uru
nakwa otú nkwa ndị o kwere
si gbasa gị.
Ị chọọ ịmata ebe dị gị nso
a ga-anọ echeta ọnwụ Jizọs,
nata Ndịàmà Jehova akwụkwọ
ha ji akpọ ndị mmadụ òkù,
ma ọ bụ gị agaa na jw.org/ig
dejupụta fọm e ji achọta
ebe anyị na-amụ ihe.